Ntuzi Aka Gbasara Ezi Omume Ga-Ebute Mmawanye Mma Okpukpa Okuko Na Mgbanwe Ihu Eliigwe (Better Poultry Management Practices with Changes in Climate)
Feed the Future Innovation Lab for Food Security Policy
Nigeria Agricultural Policy Project & Alliance for African Partnership December 2018
Source: Authors
Gini bu mgbanwe ihi elu eliigwe?
Mgbanwe ihu eliigwe bu mgbanwe ogologo nke oge na nke usoro oge kwa mgbe. A na-ahu ya site na temperecho ide elu, mgbanwe di elu na mmiri ozuzo n'abaghi uru na-agbanwe agbanwe n'oge a kara aka na n'emereme eliigwe na-agafe Kari oke. O bughi mgbanwe nile na-agafe site n'oge ruo n'oge nke mmadu n'apughi ichoputa. N'agbanyeghi, otutu oge gaa,anyi na-ahu mmeputa mgbanwe n'ugbo/ubi nakwa oru anyi
Mputara mgbanwe ihu eliigwe nye izu okuko ?
Mgbanwe ihu eligwe putara mbawanye nsogbu okpomooku nye ozuzu okuko. Nsogbu okpomooku bu mgbe oge akaraka gara elu karia ka o kwesiri maobukwanu inwe agugo n’ubochi okpomooku niile. Ebe Obuna umuokuko anaghi eri nri otu O kwesiri n’oge okpomooku, nke a putara na nsogbu okpomooku na-agba elu n’akuku mmeputa nile: n’otu ha si eto, igba anu na idi mma anu ha nakwa akwa ha tinyekwara ahu ha iluso nje oria di iche iche ogu maobu (imuniti) Mgbe obula temperecho gafere digrii iri ato nke Celaius n’oge ugbua, a na enwe ntaramahu okuko na onwu okuko iri elu. Anyi kwesiri ichoputago na oge obula mmiri onunu di oku umu okuko anaghi eri nri maobu nuo mmiri nke oma . Nke a putara, obere akwa na obere anu broiler. Na-iganihu, temperecho iri elu na-ebute oria di iche iche. Na nchikota mgbanwe ihu elugwe na-ewedata mmeputa nke okuko ma na-etinye ha n’onodu nsogbu. Mgbe obula mmeputa gbadara, uru si na-izu okuko naagbadatakwa. Nke a na-akpa akunauba onye na-azu okuko aka ojoo.
Gini ka i ga-eme n’ugbo maobu n'ubi gi ugbu a?
Ozioma!
E nwere uzo maobu ukpuru di iche iche I ga-agbaso n’otu ntabianya iji wedata mputara nsogbu okpomooku. Anyi agwala ndi ozu okuko dika unu okwu n’oge wokushop nakwa oge anyi gara leta ugbo/ubi okuko ha. Ndi ozu okuko ndi a gwara anyi ufodu ihe di iche iche ha na-eme iji mee ka nsogbu okpomooku ghara iwedata ogo mmeputa n’ugbo ha. I nwere ike ime ihe ha mere.
Source: Authors
Kedu etu i nwere ike isi belata nsogbu okpomooku n’ugbo okuko gi ?
1) Kwusi izu okuko ndi na-eji oji n’ihina ha naanabata okpomooku.
2) Gbaa mbo hu na ikuku na-abata ma na-apu otu o kwesiri n’ime ugbo okuko gi. I nwee ike, zuba okuko ndi FUNAAB dika Shika Brown. I nwekwara ike izu okuko di iche iche ndi ozo naacha waati maobu ndi n’anaghi eji oji nke okpomooku n’agaghi egbu osiiso.
Source: Authors
Kedu etu i nwere ike isi mee ka gburugburu ugbo gi na mmiri onunu okuko gi juo oyi oge okpomooku ?
1) Kuo osisi dika abirika maobu ogede iji weda igwugwu maobu ndo nye umu okuko gi.
2) Gbanwee lita oge obula iji gbanahu ushi ojoo na oghom di na ya.
3) Gbaa mbo hu na itinyeghi otutu okuko n’obere ohere. Ya bu otutu okuko ekwesighi ino n’ime obere keeji. okuko kwesiri inwe ebe ngaghari tosiri etosi nakwa ezi obosara ebe ikuku ga na-efebata ma na-efepukwa. Zuru eletriiki bolbu ndi na-acha waati tinye n’ulo okuko gi n’hina ha anaghi ebute okpomooku. Lie paipu mmiri okuko n’ala iji gbochie okpomooku manyekwa umu okuko gi vitamin C na mmiri toniiki iji hu na okpomooku enyeghi ha nsogbu ebe o di ukwuu.
4) I na-eche uche ibido ugbo Aqua culture? Nke a ga enyere gi aka ime ka mmiri okuko gi juo oyi ma o buru na I ruo ya n’ugbo okuko gi.
5) Ihe a ga-eme gbochie oria di oke mkpa. Soro vasineshon kalenda na usoro ogwu di mkpa ndi ozo.
6) Were "water misting" mee ka mmiri okuko gi juo oyi n'oge oke okpomooku.
7) Oburu na I na-eji mmiri tanki azu okuko, kwafuo mmiri di oku ma pompunye mmiri juru oyi site n'omi maobukwanu borehole otu ntabianya I choro inye umuokuko mmiri, O burukwanu na I na-enye okuko gi mmiri site na-ituru mmiri n'omi, gaa n'omi kuru mmiri mgbe obula I choro inye okuko gi mmiri. Site n’uzo di otua, umuokuko ga na-anu mmiri juru oyi ma na-eri nri ofuma.
8) Buba tanki mmiri okuko gi n’ime ulo okuko iji gbochie anwu icha ya n’oge ehihie.
9) Mmiri okuko gi di oku, tinye ya ‘ice block' iji mee ka o juo oyi.
10) Inye okuko nri awa ano maobu ise tupu oge okpomooku aria elu ga-eme ka ahu ha nabata nri ahu otu o kwesiri tupu okpomooku apalite.
11) Nye okuko gi ogwu na-egbochi nsogbu okpomooku. Nke a ga-enyere ha aka ino n'ahuike oge okpomooku.
Kedu ihe ndi ozo i ga-ebu n’uche n’obianihu?
1) Tinyere igbaso usoro niile a ruturu aka na mbido ederede a nke n'anaghi ewe otutu ego, I nwere ike ibido nhazi. Ndi sayensi nchoputa ekwuola na oburu na ndi isi ochichi enweghi nkwekota gbarara mitigeshon ezu, ihe gbarara mgbanwe ihu eliigwe ga-ajowanye njo.
2) O buruna I na-akwado iru ulo okuko ohuru, I kwesiri itinye echiche n'ihe gbasara nhazi. Anyanwu ututu na-esi n’owuwa anyanwu aputa ma na-esi n’odida na-ada. Ya mere ebe tokariri n’ogologo n’ulo okuko kwesiri ichewe ihu n'owuwa anyanwu dunye azu n'odida ya. Udi nhazi a putara na anyanwu agaghi achabata n’ulo okuko nke ga-eme ka ugbo okuko juo oyi.
3) Gbaa mbo hu na elu uko ugbo okuko gi di elu otu o kwesiri. Nke a ga-eme ka ikuku bata ma puo n'enweghi nsogbu obula.
4) Leba anya n’ihe gbarara njuputa oba okuko gi. Ya bu okuko ole tosiri ino n’ohere I nwere n'oge okpomooku.
5) Oburu na ugbo okuko gi no n’ime ohia maobu ebe n’emepeghi emepe, I nwere ike iji waya gbaa ubi gi ogige kama I ga-eji mgbaja simenti. Nke a ga-eme ka ugbo okuko gi noro na nchebe ma meekwa ka e nwee mfesa ikuku nke mgbaja simenti n’agaghi enye. Iji alumunuim na asbestos ekpuchi elu ulo ugbo okuko ka mma karia iji zinki n’ihina zinki na-anabata okpomooku. Ma ya buru ulo arurula aru, leba anya maobu tinye uche na-itinye faanu ga naeeku ime ka gburugburu ulo ugbo okuko juo oyi.
Maka ozi gbasara ihe ndi e deputara n’edemede a: kpoo
Dr. Kazeem Bello (Federal University ofAgriculture, Abeokuta kazeembello19@gmail.com (+2348032204658), Dr. Buba Wahe, NAERLS, Ahmadu Bello University Zaria, bubawahe@gmail.com (+234806539885), Dr. Toba Adeyeye +2348083058853, Dr. Saweda Onipede Liverpool-Tasie, Michigan State University, lliverp@msu.edu. Translated by Prof. Chryss F. I. Onwuka, Dept. of Animal Nutrition, Federal University of Agriculture, Abeokuta.
This manual was jointly produced by a team of global citizens concerned about climate change and food security in Nigeria. The production of this document was supported by the Feed the Future Nigeria Agricultural Policy Project and Michigan State University’s Alliance for African Partnership.
Comments
Post a Comment